Tuesday, 15 October 2019

Ụmụada anyi ji eme ọnụ - Alisonomi

Nke anyi bu nke anyi mana nke onye bukwanụ nke onye. Ọ bụ ezie na egbe bere ugo bere kama na onweghikwanu mgbe egbe ga-aga chọba ugo ka ọ bia bere n'ihi na nani onye i gwara ebe mmiri siri tiba gi ga-ahapụrụ gi ọnọdụ n'ihụ ọkụ. Ọ bụkwanụ ezie na nani nwata kwọrọ aka so ndi okenye eri ihe. 
N'ụbọchi olemole gara-aga, anyi dere maka umu okorobia ndi Afrika mepụtara Afrika ihụ. Tata, anyi na ewetere ụnụ akụkọ ụmụ nwanyi ndi isi oji meputara anyi ihụ n'ụzọ di iche iche. Ha di ụzọ abua. Ndi izizi bụ ndi mere ihe ana-akpọ Black Girl Magic - ihe anwa nsi nwaagbọghọ isi oji. Black Girl magic bu  aha eji akọwa mgbe nwa agboghọ onye isi oji mere ihe itunanya nke emebeghi na mbụ, ma ọ bụ gosiri ike aka ya n'ụzọ pụrụ iche. Nke abua a buụrụ nwanyi onye isi oji nke izizi tiri ugo na nzere iji mara akwụkwọ kacha di mma nke The Booker Prize na-eme kwaa afọ. 
Nani na ngwucha izu a ka Simone Biles bu nwaada si mba Amerika tiri ugo n’ụzọ pụrụ iche na asọmupi nke egwuriegwu di iche iche. Nwaada Simone Biles di afọ 22 (Iri abua na abụa) bụrụ onye kacha tiri ugo n’akụkọ gbasara egwuriegwu nke Olimpiks n'ụwa nile. Site na akara ugo nke iri abuọ na ise, nke Simone nwetara, ọ ghọrọ onye izizi nwetara ọnụ ọgụgụ ahụ n'otu emume egweriegwu Olimpiks n'ụwa nile. Ihe mere mmeri Simone ji adaa nnụkwụ ụda abụghi nani maka ọnụ ọgụgụ akara ugo ọchi, kama ọ bụ maka etu mmeri ya nile siri di. Ogosiri ụwa n'ọdi nkwadebe kwuru jịị. 
Onye nke abụa bu nwaada Brigid Kosgei, onye Kenya nke bụrụ nwanyi izizi jiri elekere abua na nkeji iri na anọ gbacha ọsọ maratọn. Nwa agbogha a tiri ugo ahu mgbe ụbochi olemole nke onye obodo ya ọzọ ana-akpọ Eliud Kipchoge gosiri ụwa na Kenya nwere ndi mmadu n'ọsọ maratọn. Nwaada Brigid Kosgei nke di afọ 25 - iri abụa na ise, napụrụ Paula Radcliffe bu onye jii akara ugo a eri afọ iri na isi (16).  
Onye nke atọ bu Coco Gauff bu onye mba Amerika di afọ iri na ise. Nwaada Coco tiri ugo na asọmpi Tenis nke enwere na Wembledon. Site na mmeri nke ya, Nwada Coco Gauff bụrụ sọ otu obere nwata nwanyi meriri na asọmpi Tenis  n'uwa nile eri afọ iri na ise. Ọ bukwa nwata nwanyi izizi si Amerika nani ya meriri n'asọmpi Tenis eri afọ 1991. Mmeri Coco gosiri uwa na umunwanyi isi oji di nkwadebe i nọchi anya umuada Williams mgbe ha ga-ala ezumike nka. 
Na ngwucha, akụkọ ruru anyi nti na ụbọchi abua gara-aga bu na nwada Bernardine Anne Mobolaji Evaristo edenyela aha ya n'akwụkwọ ndi ọkacha mara na ide akwụkwọ. Nwada Evaristo bu onye England na onye amara-ama na ide akwụkwọ bu Margaret Atwater bu ndi meriri na asọmpi nke akwụkwọ kacha ibe ya nke ndi Booker Prize na agbazi.

No comments:

Post a Comment