Friday, 11 October 2019

Ruwanda enyeela Afrika ụlọ ọrụ teknụzụ izizi nke na-emepụta ekwe nti - Alisonomi

https://encrypted-tbn0.gstatic.com/images?q=tbn%3AANd9GcTHtYyvzO28ZILnb9PNvTaaaUAFUP5pR3FpU1qFrNsKNQVehGT2
Mba Rụwanda abụrụla obodo izizi mepụtara ekwe nti n’Afrika. Tụpụ Rụwanda egosipụta ọru aka ha, obodo di iche iche dika Saut-Afrika, Igiptu, Etiopia na Algeria n’emepụtabụ ekwe nti, mana, mpakari ngwa ha ji emepụta ha si mba ofesi abia; anaghi arụ ya n’Afrika. Ọ bụ ihe mere Rụwanda jiri bụrụ mba mbụ mepere Afrika ụzọ n’ihe gbasara imepụta ekwe nti n’Afrika. 
N’emụme iji gosipụta ọru aka ahụ nke ha mere n’ụbọchi monde gara-aga, onye isi nchi ala obodo ahụ a na-akpọ Maazi Pọl Kagame gosiri ụwa ekwe nti abua bụ akwụa-akwụrụ nke ndi otu Mara rụrụ. Ekwe nti nke mbụ ha kpọrọ Mara X ga-ada ihe dika  50 000 (pụkụ naira iri ise) n’ahia ebe nke abua ha kpọrọ Mara Z ga-ada ihe dika 70 000 (pụkụ naira iri asaa). 
Ihe mere ka ekwe nti ndi a Rụwanda wepụtara bụrụ ihe Afrika ga-eji mee ọnụ bụ na ọ bụ sọsọ ekwe nti arụrụ ihe nile ejiri mepụta ya n’ala Afrika. N’emụme igosipụta ekwe nti ndi a, Maazi Pọl Kagame bụ onye isi ala Rụwanda kwụrụ na obodo ha na-enye Afrika ụlọ ọrụ teknụzụ izizi nke na-emepụta ekwe nti n’Afrika. 

No comments:

Post a comment