Wednesday, 4 September 2019

Asọkata Eze anya, ekpuru nkata n'isi gwaa Eze okwu - Alisonomi

Ndi ndu na-achi obodo South Afrika egosiputala ọzọ na ha ejighi ndu ndi mbiambia kpọrọ ihe. Uwa nile huru etu ihe ọjọ umu na-etolita etolita n'Obodo ahu siri we na-afiọ na webu. N'ihe ngosi rutere anyi aka, umu okorobia na umu agboghobia ndi mba South Afrika na-emebicha ihe ndi mbiabia ma na-emerucha ọtụtụ n'ime ha ahu. 
Iji kwuo eziokwu, ọ bughi taa ka ndi obodo ahu bidoro kpaba agwa ọjọ di etu ahu. Ọ dizi ka ọ bu njiri mara ndi South Afrika maka na ọ na-abụ ọ gafee onwa olemaole, ihe ahu na-eme ha n'isi agbakaa. Ọ pụtara na ihe na-akụrụ ha bu ngwese egwu bi n'ime ala? 
Ndi umuokorobia ha na-ebo ndi mbibia si mba na-etolita etolita ebo i nara ha ọrụ n'ike. Mana ajuju anyi na-ajụ bu : kedu ihe mere na South Afrika na-ata aka nyere ya nri arụ? Mgbe ndi South Afrika na-enwe nsogbu maka nnwere onwe ha, ọ bụ ọtụtụ n'ime obodo ndi ahu gbatara ha ọsọ enyemaaka. 
N'aka ọzọ, kedu ihe mere na ndi ọchichi obodo South Afrika achọghi idozi okwu a n'ụzọ tosiri etosi? Ọ bụrụ na ndi umu okorobia na ndi umu agbọghọbia ndi a nile si obodo n'etolita etolita na-anara ndi South Afrika ọrụ n'ike - mana anyi maa na otu abughi ezie - gini mere na gọọmenti ha enyeghi ndi ahu ọkwa isi na South Afrika puọ? 
Elebe anya nke ọma, ọ di m ka ndi na-achi obodo di iche n'Afrika ejighi ndu anyi kpọrọ ihe. Ihe di etu a na-eme oge ọ bula mana onweghikwanu ihe ha mere gosiri na ha chọrọ ka ihe ahu kwusi. Echere m na ọ bụrụ na ndi ọchichi anyi kpuru nkata n'isi gwaa ndi ọchichi South Afrika okwu.

Abstract: Most of the African leaders are selfish. It is one of the reasons why the xenophobic attacks going on in South Africa persist. If South African leaders have ever taken the situation serious, a solution would have been found to counter the barbarism. 
It’s then high time that other African leaders ask them to give account of their stewardship. If not, this nonsense will continue to tarnish the image of our continent. 

No comments:

Post a comment